Hosea 13

Iwe Chineke megide Izrel

1Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji,
nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel.
Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.
2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie,
ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche,
nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma,
ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka.
Ha onwe ha na-ekwu,
“Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ.
Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”
3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ,
maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa,
dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka,
dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.

4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị,
siterịị nʼala Ijipt.
Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m.
Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
5Elekọtara m unu nʼime ọzara,
nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ.
Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga,
chefuo m.
7Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm;
maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.
8Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya,
dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha
aga m eripịa ha dịka ọdụm,
anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.

9“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel,
onye pụrụ inyere gị aka?
10Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị?
Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ,
bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị,
‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?
11Esitere m nʼiwe m nye gị eze,
sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.
12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe;
a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
13Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya;
maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche.
Mgbe oge ya zuru,
ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.

14“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ.
Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ.
Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị?
Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị?

“Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,
15ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile.
Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere,
ga-esi nʼọzara fekwasị ya.
Isi iyi niile ga-ata,
olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa.
A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile,
na akụ niile o nwere.
16Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya,
nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha.
A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile,
tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala,
jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
Copyright information for IboBIU